7. N'ihi na ala nke ṅuworo miri-ozuzo nke nēzokwasi ya ọtutu mb͕e, nke nēpuputa kwa nkpa-akwukwọ kwesiri ndi ahu, bú ndi anālu kwa ya ọlu n'ihi ha, ala ahu nēkère ngọzi si n'aka Chineke bia:
8. ma ọ buru na ọ nēweputa ogwu na uke, ọ bu ihe ajuru aju, di kwa ọbubu-ọnu nso; nke ọgwugwu-ya bu ire ya ọku.
9. Ma, ndi m'huru n'anya, emewo ka ayi kwere ihe ka nma bayere unu, bú ihe nke ha na nzọputa yikọ kwa, ọ bu ezie na ayi nēkwu otú a:
10. n'ihi na Chineke abughi onye ajọ omume ichezọ ọlu-unu na ihu-n'anya ahu unu gosiri n'ebe aha-Ya di, ebe unu jere ndi nsọ ozi, nēje-kwa-ra ha ozi.
11. Ma ọ nāgu ayi agu ka unu nile n'otù n'otù we nēgosi otù inu-ọku-n'obi ahu ka unu we nwezue olile-anya-ayi rue ọgwugwu ihe nile:
12. ka unu we ghara ighọ ndi ume-ngwu, kama ka unu we buru ndi nēṅomi ndi ahu ndi ji okwukwe na ogologo-ntachi-obi nēketa nkwa ahu.
13. N'ihi na mb͕e Chineke kwere Abraham nkwa, ebe Ọ nēnweghi onye ọ bula ka Ya uku iji ṅu iyí, O ji Onwe-ya ṅu iyí,
14. si, Me-elu-me-ala n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme ka i ba uba.
15. Otú a o we nwe ogologo-ntachi-obi, we nata kwa nkwa ahu.