4. Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di.
5. Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli.
6. Ya mere ayi were obi-ike si,Onye-nwe-ayi bu onye nēyerem aka;Gini ka madu gēmem?
7. Nēchetanu ndi-isi-unu, bú madu ndi gwara unu okwu Chineke; nēkiri-kwa-nu ọpupu nke ibi-obi-ha, nēṅomi-kwa-nu okwukwe-ha.
8. Jisus Kraist di otù aka ahu nnyahu na ta, ma rukwa mb͕e nile ebighi-ebi.
9. Unu ekwela ka ewere ozizí di iche iche nke si kwa n'ebe ọzọ puta duhie unu: n'ihi na ọ di nma ka ewere amara me ka obi-unu guzosie ike; ka aghara iwere ihe-oriri, nke ọ dighi mb͕e ha bara ndi jeghariri nime ha urù.