Ndi Galetia 4:14-18 Bible Nso (IGBOB)

14. unu akpọghi kwa ihe di n'anu-arum nke bu ọnwunwa n'ebe unu nọ ihe-efu, ọ sọghi kwa unu oyi; kama unu naram nke-ọma dika mọ-ozi nke Chineke, dika Kraist Jisus.

15. Òle ebe ọ di kwa, bú ọkpukpọ unu nākpọ onwe-unu ndi ngọzi diri? n'ihi na ab͕aram unu àmà, na, ọ buru na ọ bu ihe unu puru ime, unu gāghuputawori anya-unu nyem.

16. Ya mere àghọwom onye-iro-unu, n'ihi na anamagwa unu ezi-okwu?

17. Ha were obi nānu ọku chọ unu n'uzọ nādighi nma; ma ha nāchọ imechibido unu uzọ n'èzí, ka unu we were obi nānu ọku chọ ha.

18. Ma ọ di nma ka ewere obi nānu ọku chọ unu n'ihe ọma mb͕e nile, ọ bughi kwa nání mb͕e m'nọ n'etiti unu.

Ndi Galetia 4