Ndi Galetia 3:12-22 Bible Nso (IGBOB)

12. ma iwu ahu esiteghi n'okwukwe; kama, Onye nēme ihe ndia gādi ndu nime ha.

13. Kraist b͕aputara ayi n'ọbubu-ọnu nke iwu ahu, ebe Ọ ghọrọ ọbubu-ọnu n'ọnọdu-ayi: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anabu ọnu ka ọ bu, bú onye ọ bula nke anākwuba n'elu osisi:

14. ka ngọzi nke Abraham we rue ndi mba ọzọ nime Kraist Jisus; ka ayi we site n'okwukwe ahu nara nkwa Nke bu Mọ Nsọ.

15. Umu-nnam, anamekwu dika madu: Asi na ọ bu nání ọb͕ub͕a-ndu madu, mb͕e edozisiri ya nke-ọma, ọ dighi onye ọ bula nēwezuga ya, ma-ọbu nētiye ihe ọzọ nime ya.

16. Ma ọ bu Abraham ka ekwere nkwa ndia, ya na Nkpuru-ya. Ọ sighi, Na nkpuru, dika Ọ nēkwu okwu bayere ọtutu; kama dika Ọ nēkwu okwu bayere otù Onye, Ọ si, Na Nkpuru-gi, Nke bu Kraist.

17. Ma nka bu ihe m'nēkwu; Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke buruworo uzọ dozie nke-ọma, iwu ahu, nke putara mb͕e nnù arọ na orú arọ na iri gasiri, ewezugaghi ọb͕ub͕a-ndu ahu, ime nkwa ahu ka ọ ghara idi irè.

18. N'ihi na asi na ihe-nketa ahu sitere n'iwu, o siteghi kwa na nkwa ọzọ: ma Chineke esitewo na nkwa nye Abraham ihe-nketa ahu n'amara.

19. Gini kwa bu iwu ahu? Atukwasiri ya n'ihi njehie, rue mb͕e Nkpuru ahu gābia, bú Onye ekweworo nkwa; esitekwara n'aka ndi-mọ-ozi nye iwu ahu site n'aka onye-ob͕ub͕o.

20. Ma onye-ob͕ub͕o abughi nke otù onye; ma Chineke bu otù onye.

21. Ya mere, ìwu ahu nēmegide nkwa Chineke? Chineke ekwela: n'ihi na asi na enyereri iwu nke puru ime ka adi ndu, n'ezie ezi omume gēsitewori n'iwu.

22. Otú ọ di, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ mechibidoro ihe nile n'okpuru nmehie, ka ewe were nkwa ahu nke sitere n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist nye ndi kwere ekwe.

Ndi Galetia 3