11. Nke eme-kwa-ra ayi ka ayi buru ihe-nketa nime Ya, ebe eburu uzọ ka ayi àkà dika Onye ahu zubere, Onye nālusi ihe nile ike dika ìzù nke ọchichọ-Ya si di;
12. ka ayi we buru ihe agēji to ebube-Ya, ayi ndi leworo anya Kraist na mbu:
13. Onye unu onwe-unu nọ kwa nime Ya, mb͕e unu nuru okwu nke ezi-okwu ahu, bú ozi ọma nke nzọputa-unu, ọ bu kwa nime Ya, mb͕e unu kwekwa-ra na Ya, ka eji Mọ Nsọ nke nkwa ahu ka unu akàrà,
14. bú Mọ Nsọ, Onye bu ihe ayi ji mara na ayi gēketazu ihe-nketa-ayi, rue nb͕aputa nke ihe Chineke nwetara, ka ewe to ebube-Ya.
15. N'ihi nka mu onwem kwa, ebe m'nuru okwu bayere okwukwe di nime unu nke unu kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n'anya unu ji hu ndi nsọ nile,
16. ewepughi m aka n'ikele ekele bayere unu, nēhotakwa unu n'ekperem;