59. Josef we būru aru ahu, ke ya n'ezi ákwà ọcha nēnwu enwu,
60. tọb͕ọ ya n'ílì ọhu nke aka ya, nke o gwuwarari n'oké nkume: o we kpọre otù nkume uku kwachie ọnu-uzọ ílì ahu, we la.
61. Ma Meri Magdalini na Meri ọzọ nọ n'ebe ahu, nānọdu na ncherita-iru ílì ahu.
62. Ma n'echi-ya, nke bu ubọchi so ubọchi Nkwadebe, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi zukọrọ jekuru Pailat,
63. si, Onye-nwe-ayi, ayi chetara na Onye-nduhie ahu siri, mb͕e Ọ nọ na ndu, Mb͕e ubọchi atọ gasiri M'gēsi n'ọnwu bilie.