42. Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya. Ọ bu Eze Israel; ka O si n'elu obe ridata ub͕u a, ayi gēkwe kwa na Ya.
43. Ọ nātukwasi obi-Ya na Chineke; ka Ọ dọputa Ya ub͕u a, ọ buru na Ọ nāchọ Ya: n'ihi na Ọ siri, Abum Ọkpara Chineke.
44. Ndi ahu nāpunara madu ihe, ndi akpọgidere Ya na ha n'obe, nāta kwa Ya uta otù aka ahu.
45. Ma site n'oge hour nke-isi ọchichiri b͕ara n'ala ahu nile rue oge hour nke-iteghete.
46. Ma dika oge hour nke-iteghete Jisus were oké olu tie nkpu, si, Eli, Eli, lama sabaktani? nke bu, Chinekem, Chinekem, ọ̀ bu n'ihi gini ka I rapuru nání Mu?
47. Ufọdu n'etiti ndi guzoro n'ebe ahu, mb͕e ha nuru ya, ha we si, Elaija ka Nwoke a nākpọ.
48. Ngwa ngwa otù onye nime ha we b͕a ọsọ, were sponge, b͕aju ya na manya-vine b͕ara uka, tukwasi ya n'amì, nye Ya ka Ọ ṅua.
49. Ndi fọduru we si, Rapu; ka ayi hu ma Elaija nābia izọputa Ya.
50. Ma Jisus were oké olu ti nkpu ọzọ, we ra mọ-Ya nye Chineke.
51. Ma le, ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke b͕awara iberibe abua site n'elu rue ala; ala ma-kwa-ra jijiji; oké nkume b͕awa-kwa-ra;