Matiu 26:47-50 Bible Nso (IGBOB)

47. Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, we bia, ya na oké ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju nọ.

48. Ma onye nārara Ya nye nyere ha ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m'gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya: jidenu Ya.

49. Ngwa ngwa ọ biakutere Jisus, si, Ekele, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku.

50. Jisus we si ya, Eyim, me ihe i biara ime. Mb͕e ahu ha biakutere Ya, we tukwasi Jisus aka, jide Ya.

Matiu 26