Matiu 26:17-21 Bible Nso (IGBOB)

17. Ma n'ubọchi mbu nke achicha ekoghi-eko ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus, si, Òle ebe I nāchọ ka ayi doziere Gi ka I we rie oriri ngabiga?

18. O we si, Jenu n'obodo a jekuru onye di otú a, si ya, Onye-ozizí si, Ogem di nso; Mu na ndi nēso uzọm nēme ememe ngabiga n'ulo-gi.

19. Ndi nēso uzọ-Ya we me dika Jisus nyere ha iwu; ha we dozie ememe ngabiga.

20. Ma mb͕e o ruru anyasi, Ya na ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya nọduru na nri;

21. mb͕e ha nēri ihe, Ọ si, N'ezie asim unu, na otù onye si n'etiti unu puta gāraram nye.

Matiu 26