4. Jisus we za, si ha, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iduhie unu.
5. N'ihi na ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Kraist ahu; ha gēduhie kwa ọtutu madu.
6. Unu gāje inu okwu agha di iche iche na akukọ agha di iche iche: lenu ka unu ghara itu ujọ: n'ihi na ihe ndia aghaghi iputa; ma ọgwugwu ihe nile akērughi.
7. N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: oké unwu na ala-ọma-jijiji gādi kwa n'ebe di iche iche.
8. Ma ihe ndia nile bu nmalite ihe-nb͕u.
9. Mb͕e ahu ka ha gārara unu nye na nkpab͕u, ha gēb͕u kwa unu: mba nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham.
10. Mb͕e ahu ka ọtutu madu gāma kwa n'ọnyà, rara kwa ibe-ha nye, kpọ kwa ibe-ha asì.
11. Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa, duhie kwa ọtutu madu.
12. N'ihi na ihe nēmebi iwu gāba uba, ihu-n'anya nke ndi ka n'etiti madu gāju kwa oyi.
13. Ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.
14. Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n'elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mb͕e ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa.
15. Ya mere, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nke ekwuru site n'ọnu Daniel onye-amuma, ka ọ nēguzo n'ebe nsọ unu (onye nāgu, ya tugharia uche),
16. mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu:
17. onye nọ n'elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n'ulo-ya:
18. onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe uku ya.
19. Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu.