10. Mb͕e ahu ka ọtutu madu gāma kwa n'ọnyà, rara kwa ibe-ha nye, kpọ kwa ibe-ha asì.
11. Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa, duhie kwa ọtutu madu.
12. N'ihi na ihe nēmebi iwu gāba uba, ihu-n'anya nke ndi ka n'etiti madu gāju kwa oyi.
13. Ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.
14. Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n'elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mb͕e ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa.
15. Ya mere, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nke ekwuru site n'ọnu Daniel onye-amuma, ka ọ nēguzo n'ebe nsọ unu (onye nāgu, ya tugharia uche),
16. mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu:
17. onye nọ n'elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n'ulo-ya:
18. onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe uku ya.