17. O we rapu ha, si n'obodo ahu pua je Betani, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.
18. Ma n'ututu mb͕e Ọ nālaghachi n'obodo ahu, agu guru Ya.
19. Mb͕e Ọ huru otù osisi fig n'uzọ, Ọ biarue ya aru, ma Ọ hughi ihe ọ bula n'elu ya, ma-ọbughi nání akwukwọ ndu; O we si ya, Ka nkpuru ghara iputa n'elu gi ọzọ ebighi-ebi. Osisi fig ahu we kpọnwua n'otù mb͕e ahu.
20. Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, o ju ha anya, ha si, Òsisi fig ahu si aṅa kpọnwua n'otù mb͕e a?
21. Jisus we za, si ha, N'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe, ghara inwe obi abua, ọ bughi nání ihe emere osisi fig nka ka unu gēme, ma ọ buru na unu gāsi ọbuná ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri, agēme ihe ahu.