Matiu 17:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ubọchi isi gasiri Jisus chiri Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne-ya, tiyere Onwe-ya, O kuru ha rigo n'ugwu di elu we pua iche:

2. O we nwogha n'iru ha: iru-Ya we nēnwupu dika anyanwu, uwe-Ya nile we nācha ucha dika ìhè.

3. Ma le, eme ka ha hu Moses na Elaija ka ha na Ya nēkwurita okwu.

Matiu 17