Matiu 13:7-13 Bible Nso (IGBOB)

7. Nkpuru ọzọ we da n'elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha.

8. Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.

9. Onye nwere nti, ya nu.

10. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si Ya, N'ìhi gini ka I nāgwa ha okwu n'ilu?

11. O we za, si ha, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu.

12. N'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma onye ọ bula nke nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.

13. N'ihi nka ka M'nāgwa ha okwu n'ilu; n'ihi na ha adighi-ahu n'ọhuhu, ha adighi-anu kwa n'ọnunu, ha adighi-anuta kwa.

Matiu 13