Matiu 10:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. Saimon Kananiọs, na Judas Iskariot, onye ra-kwa-ra Ya nye.

5. Ndikom iri na abua ahu ka Jisus zipuru, O we nye ha iwu, si,Unu ejela n'uzọ ndi mba ọzọ, unu abà-kwa-la n'obodo ndi Sameria:

6. kama jekurunu aturu furu efu nke ulo Israel.

7. Mb͕e unu nāga, nēkwusanu, si, Ala-eze elu-igwe di nso.

8. Menu ndi aru-ha nādighi ike ka aru di ha ike, menu ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, menu ndi-ekpenta ka ha di ọcha, chupunu ndi-mọ ọjọ: n'efu ka unu natara, nyenu n'efu.

9. Unu anatala ọla-edo, ma-ọbu ọla-ọcha, ma-ọbu ọla itiye n'ihe-ọkiké-unu;

Matiu 10