Malakai 2:14-17 Bible Nso (IGBOB)

14. Ma unu asiwo, N'ìhi gini? N'ihi na Jehova aburuwo onye-àmà n'etiti gi na nwunye i lutara n'okorọbia, onye gi onwe-gi ghọḅuworo, ọ bu ezie na ya onwe-ya bu nwan yi ejikọtara gi na ya, na nwunye ọḅuḅa-ndu-gi.

15. Ọ̀ bughi kwa nání otù ka O mere, ọ bu ezie na O nwere mọ fọduru? Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka O mere nání otù? Ọ nāchọ nkpuru nke Chineke. N'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka nwoke ghara kwa ighọḅu nwunye ọ lutara n'okorọbia.

16. N'ihi na Ọ kpọwo nchupu-nwunye asì, otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, ya na onye ji ihe-ike ekpuchi uwe-ya, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: n'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka unu we ghara ighọḅu.

17. Unu ejiwo okwu nile unu me ka ike gwu Jehova. Ma unu nāsi, Nìme gini ka ayi meworo ka ike gwu Ya? N'isi, Onye ọ bula nke nēme ihe ọjọ di nma n'anya Jehova, ọ bu kwa ihe-ha nātọ Ya onwe-ya utọ; ma-ọbu òle ebe Chineke nke ikpé nọ?

Malakai 2