1. Ma uḅu a, unu ka ihe a enyere n'iwu diri, unu ndi-nchu-àjà.
2. Ọ buru na unu agaghi-anu, ọ buru kwa na unu agaghi-etiye ya n'obi-unu, inye aham nsọpuru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gēzite kwa ọbubu-ọnu ahu n'aru unu, bua ngọzi nile unu ọnu: e, abuwokwam ha ọnu, n'ihi na unu adighi-etiye ya n'obi.