Mak 7:7-16 Bible Nso (IGBOB)

7. Ma ha nēbirim isi ala n'efu,Nēzí ihe madu nyere n'iwu ka ha buru ozizí-ha.

8. Unu nārapu ihe Chineke nyere n'iwu, jide kwa ozizí madu nyere n'aka-unu idebe.

9. O we si ha, Unu nāju ihe Chineke nyere n'iwu nke-ọma, ka unu we debe ozizí nke enyere n'aka-unu idebe.

10. N'ihi na Moses siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi; na, Onye kwujọrọ nna ma-ọbu nne, ya nwua ọnwu ahu:

11. ma unu onwe-unu nāsi, Ọ buru na madu si nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n'akam bu Kọban, isi-ya bu, Ihe enyere Chineke;

12. unu ekweghi ya ọzo ka o mere nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe ọ bula:

13. nēme okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu site n'ozizí enyere unu n'aka idebe, nke unu nyere madu n'aka idebe: ọtutu ihe di otú a ka unu nēme kwa.

14. O we kpọ ìgwè madu ahu ọzọ biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu okwum, unu nile, ghọta-kwa-nu:

15. ọ dighi ihe ọ bula di madu n'ìhè nke puru imeru ya, ma ọ buru na ọ ba nime ya: kama ihe si nime madu puta bu ihe nēmeru madu.

16. Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu.

Mak 7