Mak 7:6-18 Bible Nso (IGBOB)

6. Ma Ọ siri ha, Aisaia buru amuma nke-ọma n'isi unu ndi-iru-abua, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha,Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.

7. Ma ha nēbirim isi ala n'efu,Nēzí ihe madu nyere n'iwu ka ha buru ozizí-ha.

8. Unu nārapu ihe Chineke nyere n'iwu, jide kwa ozizí madu nyere n'aka-unu idebe.

9. O we si ha, Unu nāju ihe Chineke nyere n'iwu nke-ọma, ka unu we debe ozizí nke enyere n'aka-unu idebe.

10. N'ihi na Moses siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi; na, Onye kwujọrọ nna ma-ọbu nne, ya nwua ọnwu ahu:

11. ma unu onwe-unu nāsi, Ọ buru na madu si nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n'akam bu Kọban, isi-ya bu, Ihe enyere Chineke;

12. unu ekweghi ya ọzo ka o mere nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe ọ bula:

13. nēme okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu site n'ozizí enyere unu n'aka idebe, nke unu nyere madu n'aka idebe: ọtutu ihe di otú a ka unu nēme kwa.

14. O we kpọ ìgwè madu ahu ọzọ biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu okwum, unu nile, ghọta-kwa-nu:

15. ọ dighi ihe ọ bula di madu n'ìhè nke puru imeru ya, ma ọ buru na ọ ba nime ya: kama ihe si nime madu puta bu ihe nēmeru madu.

16. Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu.

17. Mb͕e Ọ ghara ìgwè madu ahu ba n'ulo, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya isi ilu ahu.

18. O we si ha, Ùnu onwe-unu di kwa otú a ka ndi nēnweghi nghọta? Ùnu atugharighi uche-unu, na ihe ọ bula nke si n'ìhè ba nime madu, na ọ pughi imeru ya,

Mak 7