Mak 5:5-10 Bible Nso (IGBOB)

5. Mb͕e nile, abali na ehihie, o nēti kwa nkpu, were kwa nkume nēyikasi onwe-ya, n'ebe anēlì ozu na n'ugwu.

6. Mb͕e ọ huru Jisus n'ebe di anya, o we b͕a ọsọ, kpọ isi ala nye Ya;

7. mb͕e o tisiri nkpu n'oké olu, o we si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? Ewerem Chineke b͕a Gi iyi, emekpalam aru.

8. N'ihi na Ọ nāsi ya, Si nime nwoke a puta, gi mọ nādighi ọcha.

9. O we jua ya, Òle aha-gi? Ọ si Ya, Aham bu Legion; n'ihi na ayi di ọtutu.

10. Ọ we riọsie Ya ike ka Ọ ghara izipu ha n'ala ahu.

Mak 5