1. Ha we bia rue ofè ọzọ nke oké osimiri ahu, n'ala ndi Gerasa.
2. Mbe Ọ putasiri n'ub͕ọ, ngwa ngwa nwoke nke di n'aka mọ nādighi ọcha we si n'ebe anēlì ozu zute Ya,
3. nwoke ahu nwere ebe-obibi-ya n'ebe ahu anēlì ozu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru ike ya ab͕u ọzọ, ọbuná ma ewere nkpọrọ;
4. n'ihi na ewereri nkpọrọ-ukwu na nkpọrọ ke ya ọtutu mb͕e, o we nyajipusia nkpọrọ nile, kujisia nkpọrọ-ukwu nile: ọ dighi kwa onye ọ bula di ike imeju ya anya.