20. Ndi ahu bu kwa ndi aghara n'ala ahu di nma; ndi ọ bula ndi nānu okwu ahu, we nara ya, we mia nkpuru, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise.
21. O we si ha, Ànēbute oriọna ka adọba ya n'okpuru mb͕é', ma-ọbu n'okpuru ihe-ndina? ọ̀ bughi ka adọba ya n'elu ihe-idọba-oriọna?
22. N'ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, ma-ọbughi ka ewe me ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe emere ka ọ buru ihe ezoro ezo, kama ọ bu ka o we puta ìhè.