4. O we si ha, Ò ziri ezi n'iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n'ubọchi-izu-ike? ìzọputa ndu, ma-ọbu ib͕u eb͕u? Ma ha kpuchiri ọnu-ha.
5. Mb͕e O lesiri ha anya gburugburu n'iwe, ebe ọ nēwuta Ya nke-uku, bú na anēme ka obi-ha ma etili, O we si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di mbu.
6. Ndi-Farisi we pua, ngwa ngwa ha na ndi Herod we b͕a ìzù megide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì.