27. Ma ọ dighi onye ọ bula puru ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u; mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya.
28. N'ezie asim unu, Na agāb͕aghara umu madu nmehie-ha nile, na nkwulu-ha, ka ha ra, bú nke ha gēji kwulu:
29. ma onye ọ bula nke gēkwulu Mọ Nsọ enweghi nb͕aghara rue mb͕e ebighi-ebi, ma nmehie ebighi-ebi nātuhi ya:
30. n'ihi na ha nāsi, O nwere mọ nādighi ọcha.
31. Nne-Ya na umu-nne-Ya abia kwa; ha we guzo n'èzí, zigara Ya ozi, nākpọ Ya.
32. Ìgwè madu nānọ kwa Ya buruburu; ha we si Ya, Le, nne-Gi na umu-nne-Gi nọ n'èzí nāchọ Gi.