16. Saimon ka O nyekwasiri aha Pita;
17. na Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne Jemes; ha ka O nyekwasiri aha Boanajis, nke bu, Umu éb͕è-elu-igwe:
18. na Andru, na Filip, na Batọlọmiu, na Matiu, na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Tadiọs, na Saimon Kananaiọs,
19. na Judas Iskariot, onye ra-kwa-ra Ya nye.O we ba n'ulo.
20. Ìgwè madu we b͕akọ ọzọ, ya mere na ha apughi ọbuná iri nri.
21. Mb͕e ndi-ikwu-Ya nuru ya, ha we pua ijide Ya: n'ihi na ha nāsi, Anya adighi Ya nma.