8. Ìgwè madu ahu we rigo, malite iriọ ya ka o me dika ọ nēmere ha.
9. Pailat we za ha, si, Ùnu nāchọ ka m'rapuru unu Eze ndi-Ju?
10. N'ihi na ọ mara na ndi-isi-nchu-àjà rara Ya-ri nye n'ihi ekworo.
11. Ma ndi-isi-nchua-àjà kwaliri ìgwè madu ahu, ka ọ rapuru-ha Barabas kari Jisus.
12. Ma Pailat za kwa-ra ọzọ, si ha, Ọ̀ bu gini ka m'gēme kwa Onye ahu unu nākpọ Eze ndi-Ju?