Mak 13:12-19 Bible Nso (IGBOB)

12. Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'aka ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye; umu gēbili kwa imegide ndi muru ha, me kwa ka ha nwua ọnwu.

13. Madu nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agazọputa.

14. Ma mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ n'efu, ka ọ nēguzo n'ebe ọ nēkwesighi (onye nāgu, ya tugharia uche), mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu:

15. onye nọ kwa n'elu ulo, ya ghara iridata, ma-ọbu ibà nime, ikwapu ihe ọ bula n'ulo-ya:

16. onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe-ya.

17. Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu.

18. Ma kpenu ekpere ka ọ ghara idi na mb͕e oyi.

19. N'ihi na mb͕e ahu gābu nkpab͕u, nke aha nkpab͕u di otú a akādighi site na nmalite òkìkè-uwa nke Chineke kère rue mb͕e a, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.

Mak 13