Maika 2:1-2 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahuhu diri ndi nēchèputa ajọ ihe, nālu kwa ihe ọjọ n'elu ihe-ndina-ha! n'ìhè nke ututu ka ha nēme ya, n'ihi na ọ di n'ike aka-ha.

2. Ha we tukwasi anya-uku n'ubi, nara ha n'ike; ha tukwasi anya-uku n'ulo, būru ha: ha emeb͕uwo kwa ma nwoke ma ulo-ya, bú onye ọ bula na ala-nketa-ya.

Maika 2