Luk 9:36-40 Bible Nso (IGBOB)

36. Mb͕e olu ahu putasiri, ahuru nání Jisus. Ndi ahu we kpuchie ọnu-ha, ha akọghi kwa akukọ ihe ọ bula ha hururi nye onye ọ bula na mb͕e ahu.

37. O rue, n'ubọchi so ya, mb͕e ha siri n'ugwu ahu rida, na oké ìgwè madu zutere Ya.

38. Ma le, otù nwoke si n'ìgwè madu ahu ti nkpu, si, Onye-ozizí, ariọm Gi ka I le nwam nwoke anya; n'ihi na ọ bu nwam m'muru nání ya:

39. le kwa, ajọ mọ nējide ya, o we nēti nkpu na mberede; ajọ mọ ahu nēse kwa ya, me ka ọ nāsu ufufu n'ọnu, o ji kwa ike arapu ya, nēchihia ya aru nke-uku.

40. M'we riọ ndi nēso uzọ-Gi ka ha chupu ya; ma ha apughi.

Luk 9