Luk 9:30-32 Bible Nso (IGBOB)

30. Ma le, Ya na ndikom abua nēkwurita okwu, ndi bu Moses na Elaija;

31. ndi emere ka ahu ha anya n'ebube, ndi nēkwu kwa okwu bayere ọlila-Ya, nke Ọ gaje imezu na Jerusalem.

32. Ma ura jururi Pita na ndi ya na ha nọ n'anya: ma mb͕e ha tetara nke-ọma, ha hu ebube-Ya, na ndikom abua ahu Ya na ha guzoro.

Luk 9