Luk 9:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. O we kpọkọta ndi-ozi iri na abua ahu, nye ha ike na ichi-isi n'ebe ndi-mọ ọjọ nile nọ, na igwọ ọria di iche iche.

2. O we zipu ha ikwusa ala-eze Chineke, na ime ka aru di ndi-nriaria ike.

3. O we si ha, Unu ewela ihe ọ bula n'ije-unu, unu ewela nkpa-n'aka, ma-ọbu àkpà, ma-ọbu ob͕e achicha, ma-ọbu ego; unu enwe-kwa-la uwe-ime abua.

4. Ulo ọ bula unu gābà, nọgidenu n'ebe ahu, si kwa n'ebe ahu pua.

Luk 9