48. o yiri madu nke nēwu ulo, onye gwuru gwumi kwa, we tọ ntọ-ala n'elu oké nkume: mb͕e miri juru, osimiri we tikwasi ulo ahu, ma o nweghi ike ime ya ka ọ me nkpatu: n'ihi na ewuru ya nke-ọma.
49. Ma onye nānu, ma o meghi ha, yiri madu nke nēwu ulo n'elu ala nēnweghi ntọ-ala; nke osimiri tikwasiri, ngwa ngwa o we dakasi; nbibi nke ulo ahu di kwa uku.