15. na Matiu na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Saimon onye anākpọ Zilotis,
16. na Judas nwa Jemes, na Judas Iskariot, onye ghọrọ onye rara ya nye;
17. O we so ha rida, guzo n'ebe di lari, Ya na oké ìgwè ndi nēso uzọ-Ya, na oké ọtutu ndi- Ju ndi si na Judia nile na Jerusalem, na usọ oké osimiri nke Taia na Saidon, puta, ndi biara inu okwu-Ya, na ka ewe me ka aru-ha di ike n'ọria-ha nile;
18. eme-kwa-ra ka aru-ha di ike, bú ndi mọ nādighi ọcha nēsob͕u.
19. Ìgwè madu ahu nile we chọ imetu Ya aka: n'ihi na ike nēsi n'aru-Ya puta, nēme kwa ka aru di ha nile ike.
20. Ya onwe-ya we welie anya-Ya elu le ndi nēso uzọ-Ya, si, Ngọzi nādiri unu, bú ndi-ob͕eye: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke unu.