7. si, na aghaghi irara Nwa nke madu nye n'aka ndikom nēmehie emehie, na aghaghi kwa ikpọgide Ya n'obe, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.
8. Ha we cheta okwu-Ya,
9. we si n'ílì ahu laghachi, kọrọ ndi-ozi iri na otù, na ndi nile fọduru, ihe ndia nile.
10. Ma ha bu Meri Magdalini, na Joana, na Meri nne Jemes: ndinyom fọduru ndi soro ha we gwa ndi-ozi-Ya ihe ndia.
11. Okwu ndia we di ka okwu efu n'anya-ha; ha ekweghi kwa ha.
12. Ma Pita biliri, b͕a ọsọ jerue ílì; o we ruru ala, nyo nime ya, we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ nání ha; o we la n'ulo-ya, ihe nke meworo nēju kwa ya anya.