22. Ma ndinyom ufọdu n'etiti ayi mekwara ka ibobo nwua ayi n'aru, n'ihi na ha jere ílì-Ya n'isi-ututu;
23. mb͕e ha nāhughi aru-Ya, ha we bia, si, na ha hukwarari ọhù, bú ndi-mọ-ozi, ndi siri na Ọ di ndu.
24. Ufọdu n'etiti ndi soro ayi we je ílì ahu, hu kwa ya ọbuná otú ndinyom ahu kwuru: ma Ya onwe-ya ka ha nāhughi.
25. Ya onwe-ya we si ha, Unu ndi nēnweghi uche, ndi di kwa urè n'obi ikwere n'ihe nile ndi-amuma kwuru!
26. Ọ̀ bughi na Kraist aghaghi ihu ahuhu ndia, na ibà n'ebube-Ya?
27. O we malite isi n'akwukwọ Moses, si kwa n'akwukwọ ndi-amuma nile, me ka ha mata isi okwu bayere Onwe-ya n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ.
28. Ha we biarue obodo ntà ahu nso, ebe ha nāga: ma Ya onwe-ya mere dika Ọ nāga n'iru.
29. Ha we rugide Ya, si, Nọyere ayi: n'ihi na o rubewo anyasi, ubọchi agamiwo kwa ub͕u a. O we ba n'ulo inọyere ha.
30. O we rue, mb͕e Ya na ha nọdusiri na nri, na O were ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, we nēnye ha.