Luk 23:15-23 Bible Nso (IGBOB)

15. é-è, ọbuná Herod ahugh: n'ihi na o zighachiri Ya nye ayi; le kwa, ọ dighi ihe ọ bula kwesiri ọnwu nke O meworo.

16. Ya mere, m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya.

17. Ma ọ di ya nkpà irapuru ha otù onye-nkpọrọ n'ememe.

18. Ma ha nile tiri nkpu n'otù, si, Wepu Nwoke a, ma rapuru ayi Barabas:

19. onye atubàra n'ulo-nkpọrọ n'ihi otù nbili imegide ndi-isi ebiliri nime obodo ahu, ya na ib͕u-madu.

20. Pailat we gwa ha okwu ọzọ, ebe ọ nāchọ irapu Jisus;

21. ma ha tiri nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe.

22. O we si ha nke ub͕ò atọ, É-è, n'ìhi na Onye a mere ihe ọjọ gini? Ahughm ihe kwesiri inwu anwu n'aru Ya: ya mere m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya.

23. Ma ha were oké olu rugide, nāriọ ka akpọgide Ya n'obe. Olu-ha we kari ya ike.

Luk 23