8. Onye-nwe-ya we to onye ahu nāchi èzí-na-ulo nke nēme ajọ omume, n'ihi na o mere dika onye nwere uche: n'ihi na umu nke oge a nwere uche n'ebe ọb͕ọ nke aka ha nọ kari umu nke ìhè.
9. Mu onwem nāsi kwa unu, Menu ndi-eyi nye onwe-unu site n'àkù nke ajọ omume; ka, mb͕e ọ bula ọ gāgwu, ka ha we kpọbata unu n'ulo-ikwū ebighi-ebi.
10. Onye kwesiri ka atukwasi ya obi n'ihe dikarisiri ntà kwesi-kwa-ra ka atukwasi ya obi n'oké ihe: onye bu kwa onye ajọ omume n'ihe dikarisiri ntà bu kwa onye ajọ omume n'oké ihe.
11. Ya mere, ọ buru na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n'àkù ajọ omume, ònye gēnye ezi àkù n'aka-unu na ntukwasi-obi idebe?
12. Ọ buru kwa na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n'ihe onye ọzọ nwere, ònye gēnye unu ihe nke aka unu?