Luk 16:27-31 Bible Nso (IGBOB)

27. O we si, Ya mere ariọm gi, nna, ka i ziga ya n'ulo nnam;

28. n'ihi na enwerem umu-nne ise; ka o we dọ ha aka na nti, ka ha onwe-ha ghara ibia kwa n'ebe nmekpa-aru a.

29. Ma Abraham siri, Ha nwere Moses na ndi-amuma; ka ha nuru olu-ha.

30. O we si, É-è, nna Abraham: kama ọ buru na otù onye esite na ndi nwuru anwu jekuru ha, ha gēchèghari.

31. O we si ya, Ọ buru na ha anughi olu Moses na ndi-amuma, agaghi-eme kwa ka ha kweye, asi na otù onye esi na ndi nwuru anwu bilie.

Luk 16