Luk 12:6-10 Bible Nso (IGBOB)

6. Àdighi-ere egwele ise na penny abua? ma adighi-echezọ otù nime ha n'iru Chineke.

7. Ma ọbuná agiri-isi nile nke isi-unu ka aguworo. Unu atula egwu: ọnu-ahia-unu kariri nke ọtutu egwele.

8. Ma asim unu, Onye ọ bula nke gēkwuputam n'iru madu, ya ka Nwa nke madu gēkwuputa kwa n'iru ndi-mọ-ozi nke Chineke:

9. ma onye gāgọnarim n'iru madu, agāgọnari ya n'iru ndi-mọ-ozi nke Chineke.

10. Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya: ma agaghi-ab͕aghara onye gēkwulu Mọ Nsọ.

Luk 12