Levitikọs 9:6-10 Bible Nso (IGBOB)

6. Moses we si, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu ka unu me: agēme kwa ka unu hu ebube Jehova anya.

7. Moses we si Eron, Biarue ebe-ichu-àjà nso, me àjà-nmehie-gi, na àjà-nsure-ọku-gi, kpuchiere onwe-gi, kpuchi-kwa-ra ndi Israel, nmehie-unu; me kwa onyinye iji biaru nso nke ndi ahu, kpuchi-kwa-ra ha nmehie-ha; dika Jehova nyere iwu.

8. Eron we biarue ebe-ichu-àjà nso, b͕ue nwa-ehi nke àjà-nmehie nke diri ya onwe-ya.

9. Umu-ndikom Eron we wetara ya nso ọbara-ya: ọ we deye nkpisi-aka-ya n'ọbara ahu, tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà, we wusi ọbara na ntọ-ala ebe-ichu-àjà:

10. ma abuba, na akọrọ abua, na mba-imeju nke putara n'imeju, nke si n'àjà-nmehie puta, o surere ha ọku ibu ihe-nsure ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.

Levitikọs 9