Levitikọs 4:12-14 Bible Nso (IGBOB)

12. ọbuná oke-ehi ahu nile ka o gēbupu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū rue ebe di ọcha, rue ikpo-ntu, sure ya n'elu nkú n'ọku: n'elu ikpo-ntu ka agēsure ya ọku.

13. Ma ọ buru na nzukọ nile nke Israel eme ihe n'amaghi-ama, ewe zopu ihe ahu n'anya nkpọkọta Israel, ọ buru kwa na ha emewo ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ha;

14. mb͕e amara nmehie nke ha mehieworo nime ya, nkpọkọta Israel ahu gēweta kwa nso nwa-oke-ehi ibu àjà-nmehie, ha gēme kwa ka ọ bia n'iru ulo-ikwū nzute.

Levitikọs 4