Levitikọs 26:21-28 Bible Nso (IGBOB)

21. Ma ọ buru na unu ejeghari n'imegidem, we ghara ikwe igem nti; M'gātukwasi kwa unu ihe-otiti ub͕ò asa ọzọ dika nmehie-unu nile si di.

22. M'gēzite anu-ohia n'etiti unu, ha gēme kwa ka unu b͕a aka umu, ha gēb͕upu kwa anu-ulo-unu, me kwa ka unu di ole-na-ole, uzọ nile unu gātọb͕ọ kwa n'efu.

23. Ma ọ buru na adọghi unu aka na nti n'ebe M'nọ site n'ihe ndia, ma unu nējeghari n'imegidem;

24. Mu onwem gējeghari kwa n'imegide unu; M'gēti kwa unu ihe ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.

25. M'gēme kwa ka mma-agha biakwasi unu, nke nābọ̀ ọ́bọ̀ ọb͕ub͕a-ndum; agāchikọta kwa unu nime obodo nile unu: M'gēzite kwa ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu; agēnye kwa unu n'aka ndi-iro.

26. Mb͕e M'gākpajiri unu nkpa-n'aka-unu, bú achicha, ndinyom iri gēsi achicha-unu n'otù ite-ọku, ha gēweghachi kwa achicha-unu n'ọtùtù: unu gēri kwa, ma afọ agaghi-eju unu.

27. Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti n'ihe a, ma unu nējeghari n'imegidem;

28. M'gējeghari kwa n'imegide unu n'ọnuma; M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.

Levitikọs 26