Levitikọs 25:14-21 Bible Nso (IGBOB)

14. Mb͕e i gērenye madu-ibe-gi ihe-orire, ma-ọbu zuru ihe n'aka madu-ibe-gi, unu emeritala onwe-unu ihe-ike:

15. dika ọnu-ọgugu arọ si di site n'arọ jubile, otú a ka i gāzuru ihe n'aka madu-ibe-gi, dika ọnu-ọgugu arọ ihe-ọmume si di, otú a ka ọ gērenye gi.

16. Dika iba-uba nke arọ si di ka i gēme ka ọnu-ahia-ya ba uba, ọ bu kwa dika nbilata arọ si di ka i gēbilata ọnu-ahia-ya; n'ihi na ọnu-ọgugu ihe-ọmume ka ya onwe-ya nērenye gi.

17. Unu emerita-kwa-la onwe-unu ihe-ike; ma i gātu egwu Chineke-gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi.

18. Unu gēme kwa ukpurum nile, ikpém nile ka unu gēdebe kwa, me kwa ha; unu gēbi kwa n'ala ahu na ntukwasi-obi.

19. Ala ahu gāmi nkpuru-ya, unu gēriju afọ, biri nime ya na ntukwasi-obi.

20. Ma mb͕e unu gāsi, Gini ka ayi gēri n'arọ nke-asa? le, ayi agaghāgha nkpuru, ayi agaghi-achikọta kwa ihe-ọmume-ayi:

21. M'gēnye kwa ngọzim iwu idakwasi unu n'arọ nke-isi, ọ gēme-kwa-ra arọ atọ ahu ihe-ọmume.

Levitikọs 25