Levitikọs 23:4-7 Bible Nso (IGBOB)

4. Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, bú nkpọkọta nsọ, nke unu gākpọsa na mb͕e-ha akara àkà.

5. N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'etiti ehihie na anyasi, ka ngabiga nke diri Jehova gādi.

6. N'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu ka ememe achicha ekoghi-eko gādi-kwa-ra Jehova: ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko.

7. N'ubọchi mbu unu gēnwe nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

Levitikọs 23