11. ọ gēfé kwa ùkwù ahu n'iru Jehova, ka unu we buru ihe nātọ utọ: n'echi nke ubọchi-izu-ike ahu ka onye-nchu-àjà gēfé ya.
12. N'ubọchi unu nēfé ùkwù ahu, unu gēme nwa-ebulu nke zuru okè nke b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.
13. Onyinye-inata-iru-ọma-ya gābu uzọ abua n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour agwara manu, bú àjà-ọku anāchuru Jehova ibu ísì utọ: àjà-ihe-ọṅuṅu-ya gābu kwa manya-vine, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin.
14. Unu eri-kwa-la achicha, ma-ọbu ọka aṅara aṅa, ma-ọbu ọka rara oko, rue otù ubọchi a, rue mb͕e unu wetara onyinye iji biaru nso nke Chineke-unu: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile.
15. Unu gāgu-kwa-ra onwe-unu site n'echi nke ubọchi-izu-ike ahu, site n'ubọchi unu butere ùkwù nke àjà-ofufé; ubọchi-izu-ike asa zuru okè gādi: