Levitikọs 2:3-10 Bible Nso (IGBOB)

3. ma nke fọduru site n'onyinye-inata-iru-ọma ahu bu ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe: ọ bu ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile sitere n'àjà-ọku nile anāchuru Jehova.

4. Ma mb͕e i gēweta nso onyinye iji biaru nso, bú onyinye-inata-iru-ọma esiri n'ite-ọku, ọ gābu ob͕e achicha ekoghi-eko nke utu ọka flour agwara manu, ma-ọbu mbadamba-achicha ekoghi-eko nke etere manu.

5. Ma ọ buru na onyinye-gi iji biaru nso bu onyinye-inata-iru-ọma eghere n'ite eji eghe ihe, utu ọka flour agwara manu, nke nēkoghi eko, ka ọ gābu.

6. Nyawa ya na nnyawa-ya nile, wukwasi ya manu: onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu.

7. Ma ọ buru na onyinye-gi iji biaru nso bu onyinye-inata-iru-ọma eghere n'ihe ighe ihe, utu ọka flour etiyere manu ka agēji me ya.

8. I gēweta-kwa-ra Jehova onyinye-inata-iru-ọma nke eji ihe ndia me: agēweta kwa ya nso onye-nchu-àjà, ọ gēweta kwa ya n'ebe-ichu-àjà.

9. Onye-nchu-àjà gēsi kwa n'onyinye-inata-iru-ọma ahu bulie ihe-ncheta-ya, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.

10. Ma nke fọduru site n'onyinye-inata-iru-ọma ahu Bu ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe: ọbu ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile sitere n'àjà-ọku nile anāchuru Jehova.

Levitikọs 2