Levitikọs 19:26-32 Bible Nso (IGBOB)

26. Unu erila ihe ọ bula ya na ọbara-ya: unu ab͕ala afa, unu eji-kwa-la igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ.

27. Unu akọpula usọ isi-unu buruburu, ebibi-kwa-la usọ afu-ọnu-gi.

28. Unu eb͕ula eb͕ub͕u n'anu-aru-unu n'ihi nkpuru-obi madu, unu etiye-kwa-la ihe-odide, bú eb͕ub͕u-ọku, n'aru unu: Mu onwem bu Jehova.

29. Emela ka nwa-gi nwayi ghara idi nsọ, ime ka ọ ghọ nwayi nākwa iko; ka ala-gi we ghara ikwa iko, ka ala-gi we ghara kwa ijuputa na nzube ọjọ.

30. Unu gēdebe ubọchi-izu-ikem nile, tu kwa egwu ebe nsọm: Mu onwem bu Jehova.

31. Unu echela ndi nāju mọ ihe iru, unu eche-kwa-la ndi-dibia-afa iru; unu achọputala ha, iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

32. I gēbili ọtọ n'iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye, tu kwa egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.

Levitikọs 19