Levitikọs 16:2-19 Bible Nso (IGBOB)

2. Jehova we si Moses, Gwa Eron, bú nwa-nne-gi, okwu, ka ọ ghara ibata mb͕e nile n'ebe nsọ a nime ákwà-nb͕ochi, n'iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ahu; ka ọ we ghara inwu: n'ihi na nime igwe-oji ka agāhum n'elu ebe-nkpuchi-nmehie.

3. Nka ka Eron gēwere bata n'ebe nsọ a: ọ gēwere nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nmehie, na ebulu ka ọ buru àjà-nsure-ọku.

4. Uwe-ime di nsọ nke ákwà ọcha ka o gēyiri, uwe-ukwu nke ákwà ọcha gādikwasi kwa n'anu-aru-ya, agēwere kwa ihe ike n'úkwù nke ákwà ọcha ke ya, akwa nkechi nke ákwà ọcha ka agēkpukwasi kwa ya: uwe nsọ ka ha bu; ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya, we yiri ha.

5. N'aka nzukọ umu Israel ka ọ gānara kwa nkpi abua ka ha buru àjà-nmehie, na otù ebulu ka ọ buru àjà-nsure-ọku.

6. Eron gēweta kwa nso oké-ehi àjà-nmehie ahu, nke diri ya onwe-ya, ọ gēkpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ulo-ya, nmehie-ha.

7. Ọ gēwere kwa nkpi abua ahu, guzo ha n'iru Jehova n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

8. Eron gēfe kwa nzà n'elu nkpi abua ahu; otù nzà diri Jehova, otù nzà di-kwa-ra ewu-ọpupu.

9. Eron gēweta kwa nso nkpi ahu nke nzà nke diri Jehova mara, ọ gēme kwa ya ka ọ buru àjà-nmehie.

10. Ma nkpi ahu, nke nzà nke diri ewu-ọpupu mara, agēguzo ya na ndu n'iru Jehova, ikpuchi nmehie n'elu ya, izilaga ya n'ọzara ka ọ buru ewu-ọpupu.

11. Eron gēweta kwa nso oke-ehi àjà-nmehie ahu, nke diri ya onwe-ya, o gēkpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ulo-ya, nmehie-ha, o gēb͕u kwa oke-ehi àjà-nmehie ahu nke diri ya onwe-ya:

12. ọ gēwere kwa ihe-igu-ọku juputara n'icheku-ọku site n'elu ebe-ichu-àjà, site n'iru Jehova, na nju aka-ya abua nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke eji uda utọ di iche iche me, bú nke esupiara esupia, ọ gēwebata ya nime ákwà-nb͕ochi:

13. ọ gētiye kwa ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ n'elu ọku n'iru Jehova, ka anwuru-ọku nke ihe-nsure-ọku ahu nke nēsi ísì utọ we kpuchie ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ihe-àmà ahu, ka ọ we ghara inwu:

14. ọ gēwere kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, were nkpisi-aka-ya fesa ya n'iru ebe-nkpuchi-nmehie chere iru n'Iru-anyanwu; ọ bu kwa n'iru ebe-nkpuchi-nmehie ahu ka ọ gēwere nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu ub͕ò asa.

15. Ọ gēb͕u kwa nkpi àjà-nmehie ahu, nke diri ndim, webata ọbara-ya nime ákwà-nb͕ochi, were ọbara-ya me dika o were ọbara oke-ehi ahu me, fesa ya n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, na n'iru ebe-nkpuchi-nmehie:

16. ọ gēkpuchi-kwa-ra ebe nsọ a nmehie-ya, n'ihi ọrurú nile nke umu Israel, na n'ihi njehie nile ha, bú nmehie-ha nile: otú a ka ọ gēme-kwa-ra ulo-ikwū nzute, nke nēbiyere ha n'etiti ọrurú nile ha.

17. Ọ dighi kwa madu ọ bula gānọ n'ulo-ikwū nzute mb͕e ọ nābà ikpuchi nmehie n'ebe nsọ a, rue mb͕e ọ putara, kpuchisi-kwa-ra onwe-ya, kpuchisi-kwa-ra ulo-ya, kpuchisi-kwa-ra nkpọkọta nile nke Israel, nmehie-ha.

18. Ọ gāpu kwa je n'ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova, kpuchiere ya nmehie-ya; were kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, na ufọdu nime ọbara nkpi ahu, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà buruburu.

19. Ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu n'elu ya ub͕ò asa, me ya ka ọ di ọcha, do kwa ya nsọ site n'ọrurú nile nke umu Israel.

Levitikọs 16