Joshua 5:7-14 Bible Nso (IGBOB)

7. Ma umu-ha, ndi O mere ka ha bilie n'ọnọdu ha, ndi ahu ka Joshua biri úgwù: n'ihi na ndi anēbighi úgwù ka ha bu, n'ihi na ha ebìghi ha úgwù n'uzọ.

8. O rue, mb͕e ha bìzuru mba ahu nile úgwù, na ha nọduru n'ọnọdu-ha n'ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e aru-ha di ike.

9. Jehova we si Joshua, Ta ka M'kpochapuworo ihe-ita-uta nke Ijipt n'aru unu. Ewe kpọ aha ebe ahu Gilgal, rue ta.

10. Umu Israel we ma ulo-ikwū-ha na Gilgal; ha we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, n'ala ihe nādighi nke Jeriko.

11. Ha we rie ufọdu nime ihe mìrì n'ala ahu n'echi nke ngabiga ahu, bú achicha ekoghi-eko na ọka aṅara n'ọku, n'otù ubọchi ahu.

12. Manna we kwusi n'echi-ya, mb͕e ha riri ufọdu nime ihe mìrì n'ala ahu; umu Israel enweghi kwa manna ọzọ; ha we rie ihe-ọmume ala Kenean n'arọ ahu.

13. O rue, mb͕e Joshua nọ n'akuku Jeriko, na o weliri anya-ya abua, we hu, ma, le, otù nwoke nēguzo na ncherita-iru ya, mma-agha-ya amiputara amiputa di n'aka-ya: Joshua we jekuru ya, si ya, Ọ̀ bu ayi ka i diri ma-ọbu ndi nēmegide ayi?

14. Ọ si, É-è; kama mu onwem bu onye-isi usu-ndi-agha Jehova; ub͕u a ka m'biaworo. Joshua we da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si ya, Gini ka onye-nwem nāgwa orù-ya?

Joshua 5