Joshua 4:11-18 Bible Nso (IGBOB)

11. O rue, mb͕e ndi Israel nile gabigasiri, na ib͕e Jehova gabigara, ya na ndi-nchu-àjà, n'iru ndi Israel.

12. Umu Reuben, na umu Gad, na nkera ebo Manase, we gabiga n'iru umu Israel, chiri ihe-ekike-agha, dika Moses gwara ha okwu:

13. dika orú nnù uzọ ise, ndi ejikere nke usu-ndi-agha, gabigara n'iru Jehova ibu agha, rue ala ihe nādighi nke Jeriko.

14. N'ubọchi ahu ka Jehova mere Joshua ka ọ di uku n'anya Israel nile; ha we tua egwu ya, dika ha turu egwu Moses, ubọchi nile nke ndu-ya.

15. Jehova we gwa Joshua okwu, si,

16. Nye ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ihe-àmà iwu, ka ha si na Jọdan rigota.

17. Joshua we nye ndi-nchu-àjà iwu, si, Sinu na Jọdan rigota.

18. O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova siri n'etiti Jọdan rigota, mb͕e ndi-nchu-àjà sepuru ọbu-ukwu-ha rue ala-akọrọ, na miri Jọdan laghachiri n'ọnọdu-ya, we ruchie akuku-ya nile, dika na mb͕e gara aga.

Joshua 4